Flavour & Umu Obiligbo – Isi Onwe Lyrics

Isi Onwe Lyrics By Flavour

Isi Onwe Lyrics
Isi Onwe Lyrics
  • Artist Flavour
  • Featured Umu Obiligbo
  • Title Isi Onwe
  • Album Awele – EP

Zọba isi onwe gị o, ah-eh
Zọba isi onwe gị ee, chai
Zọba isi onwe gị o, ije enu o
Zọba isi onwe gị ee, maka ọ mesịa
Ị sị na a kọwasịrọọrụ gị
Ife na-eme n'enu ụwa nụ, ọ kwa n'isi mmadụ ee?
Maka ọ mesịzịa
Ị sị na a kọwasịrọọrụ gị, ije enu o
Zọba isi onwe gị ee
Ọyị m welụ nwaayọ, softly, softly eh
If you try you no succeed, biko try again
Enekwana mmadụ ibe gị anya, nwanne, zọba isi onwe gị ee
Ị na-anụ olu m, asị m gị zọba isi onwe gị ee
Ọyị m welụ nwaayọ, nwaayọ, nwaayọ ee
Nwaayọ bụ ije elu, ị na-anụ ka m na-ekwu, eeyi ee?
No matter what you are going through
Nne m eh, you better don't give up
'Cause you no know, you no know tomorrow
Nne m eh, you better don't give up
Ya kpatara nụ oo
Zọba isi onwe gị o, ah-eh (Zọba ya azọba)
Zọba isi onwe gị ee, chai
Zọba isi onwe gị o, ije enu o (Zọba ya azọba, zọba)
Zọba isi onwe gị ee, maka ọ mesịa
Ị sị na a kọwasịrọọrụ gị
(Asịkwala na a kọwasịrọọrụ gị ee)
Ife na-eme n'enu ụwa nụ, ọ kwa n'isi mmadụ ee?
(Ọ dị n'isi gị o, ọ dị n'isi gị o)
Maka ọ mesịzịa
Ị sị na a kọwasịrọọrụ gị, ije enu o (Ọ kwa ya o)
Zọba isi onwe gị ee
Ọ bụrọọ onye i jidere, i rie ya erie
Ọ bụrọọ onye i jidere, i gbuo ya egbuo
O nwere ihe ị chịtacharụ, kpọọ ya ọkụ?
Ife e mere mma, mma
Ọ na-adị ka e megbuo ya na mmanụ
Ọ bụrọọ onye i jidere, i rie ya erie
Ọ bụrọọ onye i jidere, i gbuo ya egbuo
O nwere ihe ị chịtacharụ, kpọọ ya ọkụ?
Ife e mere mma, mma
Ọ na-adị ka e megbuo ya na mmanụ
Chaị, ube mmanwụ ka mụ na-ebenụ
Ị na-anụ ka m na-ebe o? Ị na-anụ ka m na-eti o?
Iyee, akwa alịlị ka mụ na-akwa
Ị na-anụ ka m na-ebe o? Ị na-anụ ka m na-eti o?
Nwunye na-azọnụ isi e, di ye na-azọnụ isi e
Ụmụaka ga-azọkwa isi fa, Chi anyị abụlọọ otu, chaachaa
Ị na-anụ ka mụ na-ekwu e? Egwu mụ n'ije enu
Ị na-anụ ka mụ na-ebe e? Ofu nna na-amụ
Ma ofu Chi adịghị eke, nwanne m, egwu mụ ka m na-eti ee
Egwu anyị, ya ka anyị ji eje ee
Zọba isi onwe gị o, ah-eh (Zọba ya azọba)
Zọba isi onwe gị ee, chai
Zọba isi onwe gị o, ije enu o (Zọba ya, zọba, zọba)
Zọba isi onwe gị ee, maka ọ mesịa
Ị sị na a kọwasịrọọrụ gị
(Asịkwala na a kọwasịrọọrụ gị ee)
Ife na-eme n'enu ụwa nụ, ọ kwa n'isi mmadụ ee?
(Ọ dị n'isi gị o, ọ dị n'isi gị o)
Maka ọ mesịzịa
Ị sị na a kọwasịrọọrụ gị, ije enu o (Ọ kwa ya o)
Zọba isi onwe gị ee
Ọsọ loturu onye n'isi e, zọba isi onwe gị ee
Ọyị m, zọba isi onwe gị ee
Ị sị na a kọwasịrọọrụ gị, zọba isi onwe gị ee
Nwanne, zọba isi onwe gị ee, ọ kwa maka e mesịa
Ị sị na a kọwasịrọọrụ gị, asịkwala na mụ agwalọọ gị
Ọyị m, zọba isi onwe gị ee
Ife onye dị alụ ka Chukwu ji akwụ ya ụgwọ, zọba isi onwe gị ee
Ife m nụlụ, ya ka mmụ na-ekwu, eeiyee
No matter what you are going through
Nne m eh, you better don't give up
'Cause you no know, you no know tomorrow
Nne m eh, you better don't give up
Ya kpatara nụ o
Zọba isi onwe gị o, ah-eh (Zọba ya azọba)
Zọba isi onwe gị ee, chai
Zọba isi onwe gị o, ije enu o (Zọba ya, zọba, zọba)
Zọba isi onwe gị ee, maka ọ mesịa
Ị sị na a kọwasịrọọrụ gị
(Asịkwala na a kọwasịrọọrụ gị ee)
Ife na-eme n'enu ụwa nụ, ọ kwa n'isi mmadụ ee?
(Ọ dị n'isi gị o, ọ dị n'isi gị o)
Maka ọ mesịzịa
Ị sị na a kọwasịrọọrụ gị, ije enu o (Ọ kwa ya o)
Zọba isi onwe gị ee
Zọba isi onwe gị o, ah-eh
Zọba isi onwe gị ee, chai
Zọba isi onwe gị o, ije enu o
Zọba isi onwe gị ee, maka ọ mesịa
Ị sị na a kọwasịrọọrụ gị
Ife na-eme n'enu ụwa nụ, ọ kwa n'isi mmadụ ee?
Maka ọ mesịzịa
Ị sị na a kọwasịrọọrụ gị, ije enu o
Zọba isi onwe gị ee

READ ALSO  Flavour – N'abania (feat. Nigga Raw) Lyrics

Leave A Comment