Chief Stephen Osita Osadebe – Yoba Chukwu Lyrics

Yoba Chukwu Lyrics By Chief Stephen Osita Osadebe

Yoba Chukwu Lyrics
Yoba Chukwu Lyrics
  • Artist Chief Stephen Osita Osadebe
  • Title Yoba Chukwu
  • Album Ndi Ochongonoko

Ka anyị yọbanụ Chukwu
Anyị a na-ekpe ekpere
Ka anyị dị ndụ
Anyị a kaa nka
Anyị acha isi awọ
Ka anyị wee lie ife anyị rụtaa n'ụwa nụ
Okongwụ chaalụ m n'ụzọ
Chaalụ m n'ụzọ ka m gaa
Na ife ị na-alụ ka m na-alụ nụ
Ngị bụ boyoyo
Yọba Chukwu, kpebe ekpere nụ
Ka ị dị ndụ, kaa nka, chaa isi awọ, ka ị bụrụ okongwụ
Na okongwụ abụrọ chaa chaa, fecha fecha
Na ngị bụ boyoyo mechaa, na ị ga-abụkwa okongwụ
Ị ga-enyekwa ndị ọzọ efe
Ma lụọ ọlụ yị ọfụma nụ
Ka ọ dabalụ yị nụ
Ka ị wee kaa nka, lie ife ị lụtaa
Na e mesịa na ị ga-abụ okongwụ
Nkwa
Yọba Chukwu, kpebe ekpere
Ka anyị dị ndụ, ka-anyị kaa nka, chaa isi awọ, lie ife anyị n'ụwa

Ka anyị dị ndụ, ka anyị kaa nka, chaa isi awọ, lie ife anyị n'ụwa
Biko yọbanụ Chukwu n'end ụwa yị
Biko kpebe nụ ekpere o
Ka ị dị ndụ n'enu ụwa yị
Ka i wee kazienụ nka nụ
Ị chazie isi awọ n'ụwa a
I wee lie ife ị lụtaa n'ụwa nụ oo
Asịna okongwụ pụbanụ
Ife ị na-alụ, ka okongwụ na-alụ nụ
Ngị bụ boyoyo nụ
Biko jisie ike kpebenụ ekpele nụ
Ka ị lụa nụ ife okongwụ lụlụ oo
Ka ị ka mụta ife n'eni ye
Emesịa na ị ga-abụ okongwụ oh
Na ọ burọ gị bụ Chi
Onye pụtaa ụwa na-ayọ Chukwu
Ka ya dị ndụ, chaa isi awọ
Ka ọ kaa nka nụ, ka ọ fụ ife ọ rụtarụ
Ka ọ na-eli ya
Boyoyo
Ị ga-atọ na boyoyo wee nwụa?
Emesịa na ị ga-abịakwa
Ị zabakwa okongwụ
Onye agbachinalụ onye Chi ya na-agbachinọlụ
Maka ife ị na-alụ, ka m na-alụ
Anọchii m yị ụzọ nụ?
Yọba Chi, kpebe ekpere
Tinye uchu n'ọlụ yị nụ
Ị pụta

READ ALSO  Amaarae – Angels in Tibet Lyrics

Leave A Comment