Chief Stephen Osita Osadebe – Okp’Uzo Enweilo Lyrics

Okp'Uzo Enweilo Lyrics By Chief Stephen Osita Osadebe

Okp'Uzo Enweilo Lyrics
Okp'Uzo Enweilo Lyrics
  • Artist Chief Stephen Osita Osadebe
  • Title Okp'Uzo Enweilo
  • Album Okpuzo Enweilo

Aha a
Meringue lets take one

Katapioka, meringue
Onye si n' nke a kasi mma n' uwa
O buzi gi bu chukwu.
Lotazi nu ife ogbu kwuru nu
Maka n' ogbu si n' ike di na agbo na agbo
Ya kpatalu ogbu ji egbu agwo
Mana agwo na egbu mmadu
Mana a na m ekwu kwanu o
Mkpu onye ji eko agbanali ya

Lee n' mmadu n' abuo pubaru ijeee o
Oru zi ka fa jeru ruo
ewetaru ife ka fa kezianu onye ga haru
Ma o buzi gini ka ewetalu?
Ewetalu efi nke di ndu kwuba
E wee kwubazie okpolu uzo
Agwazie onye izizi ka oraru
O kpo kpolu efi
Onye ikpeazu wee haru uzo
Onye ji efi egbukolu efi
O ga erisi anu efi erisi nu
Anu efi agwuzie
Keduzie ebe o ga esi wee puta?
Ya bu n' okpuzo adighi enwe ilo
Onwe uzo nwe mmadu
Ya n' aputa ife
M mu bu okpuzo enwe ilo

Chorous
igirigi ga azanu fa igirigi
igirigi
Ogologo
igirigi ga azanu fa igirigi

igirigi ga azanu fa igirigi 4

Anyi ekene be his royal highness
Obi nwosa okomma 2
Ogbelani milaa
Obi n' umu i n' ekene yi

Onye n' enyozi mmadu n' azu
O na elotazikwa n' onye ozo n' enyoazi kwa ya
Eluwa bu onye meru ike ya o nawanu
Ndie se ogologo
Mana ebe ogbo oso gbadebere
Ebe'a ka o je ije ga ejede bekwanu
Ife onye ma n' i be ya mazi ya
Uche onye o buna bu afa nke ya
Onye no n' elo na si nke o n' eme ka mma
o maazi n' ndi ozo n' elekwa ya n' nke ya kazi njo nu
Okwuto mma du
I maazi nke ana ekwu gi na azu
Ma ka unu maru kwa oo
Obi nwanyi n' achi
Nsogbu di ya nu
Olu nwanyi dili nwanyi
Nke nwoke ga adiaziri nwoke nu
Asi n' ugwu nwanyi bu di
Ugwu nwoke abuazili nwaunye
Mana nwaunye ama bia chiwa di nu.

READ ALSO  Drake – 10 Bands Lyrics

Leave A Comment